Mmalite
Obodo ọbụla nwere ihe eji ama ya, ya mere na ndị nna nna anyị ha kwudosiri ike ịhụ na ha hanyere omenala n'aka ụmụ ha nke mere na ọtụtụ ihe omenala anyị na-eme ugbụa si n'aka fere aka wee rute anyị aka. Ya bụ na ọ bụ ihe dị mma ma anyị kwudosi ike iji hụ na ya bụ ọtụtụ ihe dị mma dịgasị na omenala anyị agaghị efulari anyị n'oge nke anyị. Ọtụtụ ihe dị na omenala dị mma ma nwekwa ndị na-adịghị mma. Ya bụ, ọtụtụ ihe edere n'ederede a na-egosi ụdị omenala ndị nna anyị ha mere; ndị dị mma ma ndị na-adịghị mma.
Ebe Obodo M Dị
Igogoro dị n'ime Enugwu-Ezike. Enugwu-Ezike bụ nnukwu obodo dị n'ime mpaghara ọchịchị Igbo Eze North Local Government nke Enugu State, dị n'ime Nigeria.
Site n'ọgụgụ-ọnụ e mere n'afọ 2006, egosipụtara na Enugwu-Ezike nwere ọnụ-ọgụgụ karịrị mmadụ 259,431 ndị bi na ya. Obodo karịcharị n'ime ya bụ Igogoro Enugwu-Ezike. E nwere mpaghara obodo iri atọ na isii dị n'ime ya bụ obodo nke Igogoro bụ otu n'ime ya. Mpaghara obodo ndị ahụ gụnyere Amaja-Enugwu-Ezike, Ekposhi-Enugu-Ezike, Ezillo-Enugwu-Ezike, Igogoro-Enugwu-Ezike, Ikpamodo-Enugwu-Ezike, Mkpamute-Enugwu-Ezike, Ofodo-Enugwu-Ezike, Ogrutee-Enugwu-Ezike, Okpo-Enugwu-Ezike, Onicha-Enugwu-Ezike, Umuogbo-Enugwu-Ezike, Umuopu-Enugu-Ezike, dịrịgabazịa.
Enugu-Ezike nwere ókè ala ha na ndị Kogi Steti nke Naịjirịa. Na mgbago ugwu bụ ndị Ette, n'ọwụwa anyanwụ bụ ndị Ofante na Idoma, n'ọdịda anyanwụ bụ obodo dị ka Akpanya. Ka ọdịda ugwu–ọdịda anyanwụ bụ Ibagwa nke nọ n'ime ọchịchị Igbo Eze South. Ọdịda anyanwụ bụ Alor Agu, Unadu na Itchi. Ka ọdịda ugwu–ọwụwa anyanwụ Enugu-Ezike bụ Obollo Afor, Iheaka na Ovoko.
Ka Obodo M Si Bido
Dị ka mbido nke Enugwu-Ezike si dị na ka ndị ọka mmụta dị iche iche dị ka Ken Ugwu si dee ya [3], Enugu-Ezike sitere na Benin, Edo State nke Naịjirịa pụta. Ọ bụ nwa Oba nke Benin. Ezike Oba dị ka a na-akpọ ya bụ dinta. Otu n'ime akụkọ nwere ya na Oba nke Benin nwere nwa ọkpara (Prince) onye na-ebi ndụ ọjọọ, ma Eze Benin chọrọ ire ya ka azụ ahịa ya dị ka ohu. Eze nwaanyị chọpụtara atụmatụ a ma mee ka Nna ya bụ Oba nke Benin nye ya ọtụtụ ndị ohu ndị ga na-eso ya n'ebe ọbụla ọ na-aga.
Ya na ọtụtụ ndị ohu, sitere na ndụmọdụ Eze nwaanyị, kwagara Onitsha site Asaba. Site n'ebe ahụ, ọ kwagara Aguleri na n'ihu ka Ebenebe ma biri na Okpuno Ezike na Enugu Ukwu niile na Anambra State nke Nigeria.
Site Enugu Ukwu, ọ kwagara Igabada site na Anambra River sikwa ebe ahụ gaa n'Idah, Kogi State. Mgbe ọ garuru Idah, o biri na nke Eze nke Idah a mara dị ka Ata. Dị ka dinta ọ bụ, ọ gbara enyí (Elephant) egbe ma soro ọbara ya si na mmerụ ahụ o merụrụ ya bụ anụmanụ garuo obodo Odoru na Agbokete dị na Kogi State wee na-achụ ya ruo Ibagwa Ani ma kwọrọ ya gaa Ekoyi (Iheaka). N'ikpeazụ ọ gara Ugwueka na n'ugwu Amube ebe ọ hụrụ na ya bụ anụmanụ anwụgo. O biri na Amube n'ugwu, ya mere e ji akpọ ya Elugwu Ezike (Ejige) Oba. O wee kpọọ ebe ahụ "UFU".
Ezike Oba lụrụ nwanyị abụọ ma ha abụọ mụrụ ụmụ anọ ndị mebere Enugu-Ezike. Ndị nwunye abụọ bụ Ayigwa onye mụụrụ ya nwa mbụ, Ezzodo, na nke atọ, Essodo. Osegbe mụrụ nwa nwoke nke abụọ, Itodo, na nke anọ na ikpeazụ bụ Ozzi.
Etu Ụmụ Anọ Elugwu Ezike Ndịa Sị Mụbaa
- Ezzodo: Uda na Uroshi
- Itodo: Amufie, Amachalla na Olido, Imufu, Igbele, Ikpuiga
- Essodo: Aji, Umuagama, Umuogboulo, Umuogbo Agu, Umuogbo Inyi, Umuogbo Ekposhi, Ufodo
- Ozzi: Iji, Ugbaike, Okpo, Ugbuike Amaja, Isugwu, Umuida, Ogrute, Ezillo, Okata, Onicha Enugu, Igogoro, Ikpamodo, Umuopu, Umuopu Agu, Nkpamute, Owerre Eze, Umachi, Amube, Ogbodu, Aguibeje
Omenala Eji Mara Igogoro
Omabe
Enwere ọtụtụ ụdị mma omenala eji mara ndị Igogoro nke mma Omabe bụ otu n'ime ha. Ụmụ amaala ndị Igogoro, Enugu-Ezike, a na-amara ha dị ka ndị na-eti mmọnwụ n'oge gboo. N'ezie, e ji ọtụtụ mmụọnwụ ndị a eme ka obodo kwụsie ike site n'iji ha na-ana ụtụ dị iche iche (tax collecting). Ejikwa ya eme ka ọrụ obodo na-aga n'ihu. Ịma atụ: oge ọbụla ọha obodo nwere ọrụ, e ji Omabe eme ka ndị mmadụ kwụsie ike na-arụ ya bụ ọrụ. Oge ọbụla ọ na-apụta, ndị obodo na-enwe aṅụrị ọkachasị ụmụaka maka na ọ bụ ihe egwuregwu.
Mgbanwe Batara na Mmọnwụ Ugbua
Site n'ọbịbịa ndị Ụka n'ala anyị, mmemme dị iche iche enwetala ọtụtụ mgbanwe. Sitekwa n'otito, mmepe na ogo ụbụrụ mmadụ nakwa nke ụwa gbaa gburugburu, e nwela ọtụtụ nhazi nke etinyechara na ha bụ mmemme iji wee mee ka ogo ya gbagote. Abịa n'ihe gbasara mmọnwụ e ji eme mmemme a, e meela ka mmọnwụ nwee ugwu na nsọpụrụ n'ebe mmadụ nkịtị nọ. N'abụghị ka ọ dịbụ na mbụ mgbe ọ bụ sọ mmadụ na-asọpụrụ mmọnwụ. Ugbu a, ya bụ ugwu bụzị nkwanyere-nkwanyere. Mmọnwụ ọ bụla mere onwe ya dị ka ihe egwuregwu, ụmụaka na ụmụnwanyị enyere ya aka were ya wee mee ihe egwuregwu n'ihi na a sịrị:
"Onye mee onwe ya oke, nwaologbo achụwa ya ọsọ."
Abịakwa n'ihe gbasara mmọnwụ a, ọ dịghịkwa ka ọ dịbụ na mbụ mgbe a na-eji ọgwụ eme ya. Ugbu a, ọ na-abụzịkarị ihe egwuregwu iji wee kpaa obi ọma ma kwagotekwa ogo mmemme iri Ji Ọhụrụ a na-eme. N'oge ochie, ndị mmadụ ji mmọnwụ wee na-emegide ndị ha hụrụ dị ka ndị iro ha. Nke a ka ha na-emejuputanwu n'ihi oke ugwu, nsọpụrụ na nkwanye e nwere n'ebe mmọnwụ nọ. Ugbu a, Ụka abịala wee bịa weta ọnọdụ dị otu ahụ n'isi njedebe.
Ịrụpụta Mkpụrụ Osisi
Ịrụpụta mkpụrụ osisi bụ ụzọ nke gbasara ịkụ mkpụrụ osisi, ijikwata ya, ịghọta ya oge o tochara na ire ya maọbụ iri ya eri. Mkpụrụ osisi ndị a gụnyegasịrị: unere, ube, oroma, akụ bekee, njara (plantain), ọkwụrụ bekee (pawpaw), shoroshopu, painapuru, udara, mango, kashu, aṅara, gova, ube ọka, wdg.
"Nkụ dị na mba na-eghere mba nri."
Maka na nkụ dị na mba na-eghere mba nri, ndị obodo m (Igogoro) na-agbado anya n'ihe gbasatara imeputa mkpụrụ osisi, n'ihi na o nwere nnukwu uru dị na ya. Ọ bụ nke a mere na ọrịa (sickness) anaghị arịa ha ọtụtụ mgbe. Ahụ ndị be anyị na-adịkwa ka ogbodo ji a kụrụ n'akụkụ mmiri n'oge ọkọchị. Mkpụrụ osisi ndị a na-ezuru anyị ma fọdụ nke a na-ebuga ahịa iji were gbanwọta ego ndị bekee e ji azụta ihe ndị ọzọ na-akpa mmadụ. Ị gaa ụbọchị ahịa Nkwọ niile, ị ghaghị ịhụ na ihe na-aga ebe ahụ karịrị ole m nwere ike ịkọwapụta, maka na o nwerokwanụ ka mmadụ nwee ike ịkwụcha etu ihe ọ na-ekwu maka ya siri dị. Aha ahịa ndị be anyị na-azụ bụ Nkwọ nke dị na Nkwọ Ụlọ Igogoro.
Ihe na-eme na mkpụrụ osisi na-abụ "atụrụ tawa" na be anyị bụ na nwoke ma nwanyị ọbụla nwere ala ubi na-agba mbọ hụ na ọ kụnyere osisi dị iche iche n'ala ya. Ha na-akụnyecha ha ka o wee bụrụ na ka a na-eche ka ihe a kụrụ n'ubi kaa aka (mature), e were mkpụrụ osisi ndị chara acha ma kaa aka na-emegheri ọnụ ma na-enwetakwu ego, n'ihi na:
"Ọkwa gwara ụmụ ya na onye tụrụ ji ya tụkwazie mgbọrọgwụ, nke ọ ga-abụ na onye nwe ji gwuru ji, ha ejiri mgbọrọgwụ biwe."
Emume Okpa Uche na Nkwadobe Ya
E nwere ọtụtụ mmemme e jiri mara ndị obodo m. Iji maa atụ, ha na-eme emume nke ụfọdụ n'ime ha gụnyere Ekeresimesi, Mmọnwụ nakwa Ịba Mmọnwụ, Ịchi Ọzọ maọbụ Nze nakwa Ịgba Ọfala wdgz. N'ime emume ndị a niile a kpọpụtachagoro, nke kacha pụta ihe ma dịkwa ire wee ruo ugbu a bụ "Okpa Uche." E nwere ike sị kwa n'ihe kpatara ụdị ọnọdụ a bụ site n'ọbịbịa nke ndị Ụka n'ala anyị nke wetakwara ọtụtụ mgbanwe. Ụfọdụ n'ime emume ndị nke a m kpọpụtara na-adahazị azụ. Nke a bụ n'ihi ụzọ nakwa usoro ụfọdụ e ji eme ya adabatachaghị n'okwukwe nakwa nkwenye ndị Ụka nke werela ọnọdụ ebe dị ukwuu n'obodo m.
N'obodo m, a na-eme emume Okpa Uche ọnwa nke iri na otu n'afọ gbaa iri abụọ (Eleventh November of every year). Ma tupu e mee nke a, e nwekwara ụfọdụ mmemme ndị ọzọ a na-eme iji wee kwadobe ma dịkwa njikere maka nnukwu mmemme a. Igbo na-ekwu okwu sị:
"Agha a kara aka adịghị eri nwa ngwụrọ."
Ọ bụrụ na emume ahụ fọrọ ihe dị ka mkpụrụ ụbọchị isaa, onye ogbu ekwe (town crier) ga-eme ka ndị mmadụ mara na ya bụ nnukwu emume na-abịa nso.
Otite Nkwụ (Wine Tapping)
Ịte nkwụ bụkwazị okpurukpu ihe ọzọ eji mara obodo m bụ Igogoro. Ọ bụ obodo a mara ama na-eweta ọkụ n'ihe gbasara imeputa mmanya nkwụ. Nke a mere obodo ole ma ole gbara anyị gburugburu ji achọta mmanya nkwụ n'obodo m.
Enwere akụkụ nkwụ-elu na-adọwa, nwee ebe ekpo (nkwụ-ala) na-adọwa, e nwekwara ebe nkwụ a na-akpọ "akụrụ-akụ" na-atọwa. Ị chọrọ ịmata nke bụ nke ma ị bịa izụrụ mmanya nkwụ-elu n'ebe enwere ọtọ nkwụ-elu, ọtọ nkwụ-ala (ekpo) na ọtọ akụrụ-akụ, chọọ ọtọ ahụ aṅụ (bees) nke na-agba-agba jupụtara; ebe ahụ bụ ebe ị ga-enweta nkwụ-elu ma ọ bụrụ ya ka ị na-achọ. Aṅụ anaghị abịatekarị n'ọtọ akụrụ-akụ maọbụ ekpo ganye na e resịa nkwụ-elu.
1. Nkwụ-Elu (Up-Wine)
Nkwụ-elu maọbụ mmanya nkwụ-elu bụ mmanya enwetara na mkpụrụ nkwụ kwụ ọtọ dị ndụ; ọ bụ ya bụ ezigbo mmanya nkwụ. E nwere ụzọ ihe anọ eji ama Diọchị maọbụ ote nkwụ na-eme tupu o nweta mmanya nkwụ-elu:
- Nke mbụ: Ọ na-ejiri nnukwu mma rịgoro na nkwụ, bepụsịa igu ndị ahụ nọchiri ihe ahụ na-amịtawa akwụ.
- Nke abụọ: Ọ kpọpuo ihe ahụ na-amịta akwụ. Obere mma dị nkọ ka ọ ga-eji mee nke a. O mesịa ya, ọ kwachie ya ka ọ nọọ ihe dị ka ụbọchị atọ.
- Nke atọ: Ka ụbọchị anọ gasịrị, ọ bịa kwụnyesịa ihe mmanya ga-esi na-agbapụta a na-akpọ "eju aru". Ọ ga-etinyekwa ololo maọbụ obele (container), o mesịa nke a ọ lawa.
- Nke anọ: Ọ ga-abịakwazịa n'ekwe mmanya kwa mgbe kwa mgbe, ọkachasị n'ụtụtụ ụbọchị ọbụla.
Mmanya mbụ si na nkwụ a pụta ka a na-akpọ "ọhụ esu ala" (ike enu ala). Ọ bụ maka na ha anaghị ekwe ka obele o ji n'ime ya metụ n'ala mere e ji akpọ ya aha ahụ. Ọ na-eburu ya pụta n'ala buru ya n'aka na-eche onye ga-abịa jiri ego patụ ya site n'izụrụ ya. N'eziokwu, mmanya nkwụ-elu atọka. Nkwụ-elu na-ajị nnukwu ụfụfụ (fume) iji gosi ụdịrị ume na akwụ ya n'isi ọcha ya na-aba n'anya. Ị tinye ya n'ime obele maọbụ n'ime ololo kwuchie ya, ọ ghaghị ịgbawa obele maọbụ ololo ahụ. Ọ bụrụ na a wụkọta ya ọnụ, okenye ka a na-ebunye ike (bottom) mmanya dị ka ugwu na-atụwanyere ya maka na ike mmanya kacha tọọ ụtọ ma jiri arọ rọkwazịrị arọọ.
2. Ekpo (Nkwụ-Ala)
Ụdịrị mmanya nkwụ ọzọ bụ ekpo. A na-echeta maọbụ eteta nkwụ nke a n'ukwu nkwụ nke dara ada maọbụ nke egburu egbu. Diọchị na-emepụta ya na-abịa were mma dị oke nkọ gbụchasịa igu, akwụ (palm frond) na-achaghị acha, na ọmụ niile dị na nkwụ a dịna adịna n'ala. O mesịa nke a, o were obere mma dị ezigbo nkọ kpọpuo ebe ahụ ọmụ nkwụ si apụta. O mesịa nke a, o gwuo (dig) ala n'okpuru ya ebe ọ ga-atinye obele ya. O mesịa nke a, o tinye ihe mmanya ekpo ga na-agafe iji wee nwee ike ịbaa n'ime obele ahụ, kwachizie ya nke ọma ka ihe ọbụla ghara ịba n'ime ya; ọ lawazịe. O mechaa, ọ bịawa tewa ụtụtụ ọbụla iburu nkwụ ekpo.
Ekpo anaghị emenyi agụ mmanya dị ka nkwụ-elu si were na-emenyi. Ọ naghị atị ọcha dị ka nkwụ-elu, ọ naghịkwa ajị ụfụfụ dị ka nkwụ-elu. Ọ bụrụ na mmadụ ewere ya mee mmemme, a na-ewere onye ahụ ka onye enweghị ihe, maka na obere ego ka e ji azụta ya.
3. Akụrụ-Akụ
Nke atọ bụ mmanya akụrụ-akụ. A na-enweta ya site n'iwụkọta mmanya nkwụ-elu na mmanya ekpo ọnụ. Ụfọdụ na-etinyekwa ọtọbịrịbịrị nke ndị bekee kpọrọ sugar na nke ha. Ha na-agbanyekwa ya mmiri etu dị ha mma dị ka etu uche ha siri gwa ha ka o wee buo ibu. Ha mesịa nke a, ha eburu ya gaa ire ya ere.
Ileta Ndị Ọbịa
Ejikwa ileta ndị ọbịa mara ndị Igogoro. Dị ka anyị si wee mara, ịnabata ndị ọbịa so na nkuzi Jesu Kristi na-akụziri anyị oge niile. Ndị be anyị jikwa ya arụ ọrụ ka a ga-asị na ha amụtachalarị ya bụ nkuzi. Ọ bụ ya kpatara o ji adịwa ndị mbịa-mbịa ka ọ bụ ha alazịla oge ọbụla ha bịachara be anyị. N'ịma atụ, onweghị onye ọbụla bịachara obodo m na-anaghị agba aka-ebe etu e si were ya dị ka nwa amaala. Ndị mmadụ dị iche iche ekwuputago ihe a ugboro ugboro.
N'ịgba mbọ hụ na a kọwara ndị iche dị n'etiti egbe na egbe, e nwere ụdị ndị ọbịa ụzọ dị iche iche: onye bịara ileta mmadụ maọbụ onye gara ikele mmadụ oge ọ na-agafe be ya, na ọbịa mbiara biri—nke bụ ọbịa ndị ahụ siri n'obodo ha gawa ibiri n'obodo ọzọ na-abụghị be ha.
Mgbe onye ọbịa mbiara leta bịara na be mmadụ n'obodo m, nwoke nwe ụlọ maọbụ okenye nọ n'ụlọ na-ezipụ nwatakịrị ka o were iko (cup) kute mmiri bunye onye ọbịa ahụ oge o kelechara ya. Onye ọbịa ahụ, ọ chọọ, ọ ṅụọ mmiri ahụ; ọ chọghị, ọ hapụ, mana ihe ka mkpa bụ na e mego omenala. Nke a gasịa, onye nwe ụlọ na-ebutakwa ọjị waara ya. N'oge gboo, mmadụ nwere ike iji nzu wee waara onye ọbịa ọjị; ugbua, ọ bụzị ọjị Igbo maọbụ aṅara na ose ọjị, maọbụ mmanya nkwụ. A wachara ya ọjị ma kenyechaa ya mmiri ọṅụṅụ, ndị nọ nso na-enye aka n'idozi ebe ọ ga-anọ.
Awọm Dị na Emume Enwegasịrị n'Obodo M
Enwegasịrị ọtụtụ mmemme ndị ọzọ eji mara obodo m nke na enweghị ike idecha ya n'ebe a. Awọm dị na ha bụ ndị a:
- Mmemme a na-ebute oke mmefu ego nke na-adịghị mkpa oge ụfọdụ maọbụ nke a kara iji wee mee ihe ọzọ ka mkpa.
- Oge mmemme a na-abụkwarị ndị ajọ obi na ndị arụrụala nọ n'obodo ezigbo ohere iji wee mejuputa ajọ ihe ụfọdụ ha bu n'obi.
- N'oge mmemme a, enwekwara ike inwe ụfọdụ ihe nsogbu dị iche iche dị ka nghọtahie n'etiti ndị ụmụnna, enyi na enyi, maọbụkwanụ ihe mberede nke okporo ụzọ maka ndị ga-esi mba wee lọta.
- N'obodo m n'oge mmemme a, ọnụ ahịa ihe na-arị oke elu ma ọkachasị ihe ndị e ji eme ya bụ mmemme. Nke a na-eme ụmụ ogbenye ka ha chiba ụkwụ ha n'ime ụlọ.
Uru Dị n'Ya Bụ Mmemme
Enwere ọtụtụ uru dị na ya. N'uche nke aka m, ebe ọ bụ na uru dị na mmemme a karịrị ọghọm dị ya, a ga m asị ka ya bụ mmemme gaa n'ihu. Onweghịgodụ maka ihe ọzọ, ndị kwuru okwu sị:
"A gaghị eji maka mgbagbu ghara ọgụ."
Uru ndị a gụnyere:
- Ịdịkọ n'otu ndị obodo
- Nkwalite na ọganihu obodo
- Ọ na-eme ka ndị obodo mara onwe ha
- Ọ na-eme ka ụmụaka mụta etu e si eme ihe n'aka ndị okenye
- Ọ na-akụzi nsọpụrụ n'etiti ndị obodo
Mmechi
Ihe niile m kwuru na ihe niile m gbara mbọ depụta n'obere ihu akwụkwọ ole ma ole ndị a bụ iji gosipụta mkpa ọ dị na obodo ọbụla kwesịrị ịgba mbọ hụ na ha kwudosiri ike idobe omenala ha ndị dị mma. Nkenke ihe e dere ebe a abụghị sọ ya bụ ihe eji mara omenala ndị be anyị, kama ọ bụ igosi obere n'ime ha. Abịa na Igogoro, e nwere ụzọ dị iche iche e si eme ihe ndị ọzọ dị iche iche dị ka Ịlụ nwanyị, Ịzụ ahịa, Ikpe ikpe dgz. Ya bụ ka Chineke nye anyị ike ọmụmụ nke anyị ga-ejiri amamihe O nyere anyị wee rụọrọ Ya ọrụ site n'iji ya kwalite omenala.
Original Academic Submission: Department of Philosophy, Faculty of Arts, Bigard Memorial Seminary, Uwani Enugu (Affiliate of University of Ibadan) — Course LIL 101 under Rev. Fr. Dr. Longinus Chukwuemeka Chinagorom, 19th January 2016 [1][2][3].